Psalms 57

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl.

Ntụkwasị obi nʼime Chineke

1Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,
nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.
Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba
tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.

2Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.
3Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m
na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela
Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.

4Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;
amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,
ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,
ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.

5O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile;
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

6Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,
ihe mgbu nyịturu m.
Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,
ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela

7Obi m dị njikere, o Chineke,
obi m dị njikere sikwaa ike;
aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.
8Teta nʼụra mkpụrụobi m!
Teta, ụbọ akwara na une!
Aga m akpọte chi ọbụbọ.

9O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile;
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
10Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.

11O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe;
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Copyright information for IboBIU